Obadia ISI NKE 1 1 Ọhù Obadaia. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri bayere Edom; Ayi anuwo akukọ Jehova, ezitewo kwa ozi n'etiti mba nile, si, Bilienu, ka ayi bilie imegide ya n'agha. 2 Le, emewom ka i n'etiti mba nile di ntà: Ihe-nlelì ka i bu nke-uku. 3 Npako nke obi-gi aghọb͕uwo gi, Gi onye bi na nb͕awa nke nkume di elu, onye ebe-obibi-gi di elu; Nke nāsi n'obi-ya, Ònye gēme ka m'rida n'ala? 4 Ọ buru na i weliri onwe-gi elu dika ugo, ọ buru kwa na i guzo akwu-gi n'etiti kpakpando, M'gēme kwa ka i si n'ebe ahu ridata, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 5 Ọ buru na ndi-ori abiakute gi, Ọ buru na ndi nāpunara madu ihe n'abali, (èsi gēsi aṅa bipu gi! ọ buru na ndiọbì-vine abiakute gi, ọ̀ bughi nkpuru-vine ka ha gērapu? 6 Le ka esi chọputa ihe Isọ! le ka esi chọputa ihe-Ya zoro ezo! 7 Ndikom nile nke ibe-gi emewo ka i rute n'ókè-ala: ndikom ndi gi na ha nọ n'udo aghọb͕uwo gi, we nwe ike imegide gi; Ndi nēri nri-gi etiyewo ntib͕u n'okpuru gi: ọ dighi nghọta di nime ya. 8 Ọ̀ bughi n'ubọchi ahu, ka Jehova siri, M'gaghi-ebibi ndi-amam-ihe n'Edom na nghọta n'ugwu Isọ? 9 Ma ndi-dike-gi, Timan, gātu ujọ, ka ewe bipu onye ọ bula nke ugwu Isọ site n'ob͕ub͕u. 10 N'ihi ihe-ike-gi imegide nwa-nne-gi, bú Jekob, ihere gēkpuchi gi, agēbipu kwa gi rue mb͕e ebighi-ebi. 11 N'ubọchi i guzoro n'ofè ọzọ, n'ubọchi ndi ala ọzọ dọtara usu-ndi-agha-ya n'agha, ndi ala ọzọ we ba n'ọnuuzọ-ama-ya nile, fe-kwa-ra nzà megide Jerusalem, ọbuná gi onwe-gi di ka otù nime ha. 12 Ma i gaghi-ele ubọchi nwa-nne-gi anya n'ubọchi ọ ghọrọ ọbìa; i kwesịghịkwa ịṅụrị ọṅụ n'ihi ụmụ Juda n'ụbọchị mbibi ha; ọ bughi kwa ka i gēkwu okwu npako n'ubọchi ahuhu. 13 I gaghi-abà n'ọnu-uzọ-ama ndim n'ubọchi nhuju-anya-ha; e, i gaghi-ele anya nweda-n'ala-ha n'ubọchi nhuju-anya-ha, ma-ọbu itukwasi-kwa-ra àkù-ha aka n'ubọchi nhuju-anya-ha; 14 Ma gi onwe-gi agaghi-eguzoro n'uzọ-ya, ibipu ndi-ya b͕apuru ab͕apu; ọ bughi kwa ndi-ya fọduru n'ubọchi nkpab͕u ka i gārara nye. 15 N'ihi na ubọchi Jehova di nso n'aru mba nile: dika i meworo, otú a ka agēme gi: ugwọ-ọlu-gi gālaghachi kwa n'isi-gi. 16 N'ihi na dika unu ṅuworo ihe n'ugwu nsọm, otú a ka mba nile gāṅu mb͕e nile, e, ha gāṅu, loda kwa, ha gādi kwa ka agāsi na ha akādighi. 17 Ma n’elu ugwu Zayọn ka mgbapụta ga-adị, ma a ga-adị nsọ; ulo Jekob gēnweta kwa àkù-ha. 18 Ma ulo Jekob gāghọ ọku, ulo Josef gābu kwa ire-ọku, ulo Isọ gābu kwa ahihia-ọka kpọrọ nku, ha gēreye nime ha, ripia ha; ọ dighi kwa onye fọduru nke ulo Isọ gādi; n'ihi na Jehova ekwuwo ya. 19 Ma ndi Ndida gēnweta ugwu Isọ; na ndi nọ n'ala di lari, ndi Filistia: ha gēnweta kwa ọhia Efraim, na ọhia Sameria: Benjamin gēnweta kwa Gilead. 20 Ma ọmuma-ulo-ikwū a nke umu Israel adọtara n'agha gēnweta nke ndi Kenean, rue Zarefat; ma ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ nke Jerusalem, nke di na Sefarad, gēnweta obodo nile nke Ndida. 21 Ma ndi-nzọputa gārigota n'ugwu Zaion ikpe ugwu Isọ; ala-eze ahu gābu kwa nke Jehova.